Native Bible

Isaiah 42:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a? Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu?

Isaiah 42:23 in English

Isaiah 42:23 · Berean Standard Bible

Who among you will pay attention to this? Who will listen and obey hereafter?

Context

21Onyenwe anyị emeela ka iwu ya dị ukwuu, meekwa ka ọ dị ebube, nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ isite na ya mee ka ezi omume ya pụta ìhè. 22Ma e meela ka ndị ya bụrụ ndị e zukpọrọ ihe ha nwere nʼoge agha. A kpọchikwara ha nʼolulu e gwuru nʼala, zoo ha nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ha aghọọla ihe a kwatara nʼagha, ma ọ dịghị onye na-anapụta ha. Ha aghọkwaala ihe e si nʼaka mmadụ pụnara ya nʼike, ma ọ dịghị onye na-asị ndị iro ha, “Nyeghachikwa m ihe m i ji aka ike were.” 23Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a? Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu? 24Onye weere Jekọb nyefee nʼaka ndị na-ebibi ihe, onye were Izrel nyefee ndị ohi? Ọ bụ na ọ bụghị Onyenwe anyị onye ha mehiere megide? Nʼihi na ha ekweghị eso ụzọ ya niile, ha erubeghị isi nye iwu ya. 25Ọ bụ ya mere o ji wụkwasị ndị ya iwe ọkụ ya, ihe ike nke agha. Ọ bụ ezie na iwe ya bịakwasịrị ha dịka ọkụ na-erepịa erepịa, ma ha aghọtaghị ihe kpatara ya; o repịara ha, ma ha atụgharịa uche ha banyere ya. 42:3 Ya bụ, osisi achara

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.