Aịzaya 42:23
Isaiah 42:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a? Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu?
Isaiah 42:23 in English
Isaiah 42:23 · Berean Standard Bible
Who among you will pay attention to this? Who will listen and obey hereafter?
Context
21Onyenwe anyị emeela ka iwu ya dị ukwuu,
meekwa ka ọ dị ebube,
nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ isite na ya mee ka ezi omume ya pụta ìhè. 22Ma e meela ka ndị ya bụrụ ndị e zukpọrọ ihe ha nwere nʼoge agha.
A kpọchikwara ha nʼolulu e gwuru nʼala,
zoo ha nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche.
Ha aghọọla ihe a kwatara nʼagha,
ma ọ dịghị onye na-anapụta ha.
Ha aghọkwaala ihe e si nʼaka mmadụ pụnara ya nʼike,
ma ọ dịghị onye na-asị ndị iro ha, “Nyeghachikwa m ihe m i ji aka ike were.” 23Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a?
Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu? 24Onye weere Jekọb nyefee nʼaka ndị na-ebibi ihe,
onye were Izrel nyefee ndị ohi?
Ọ bụ na ọ bụghị Onyenwe anyị
onye ha mehiere megide?
Nʼihi na ha ekweghị eso ụzọ ya niile,
ha erubeghị isi nye iwu ya. 25Ọ bụ ya mere o ji wụkwasị ndị ya iwe ọkụ ya,
ihe ike nke agha.
Ọ bụ ezie na iwe ya bịakwasịrị ha dịka ọkụ na-erepịa erepịa, ma ha aghọtaghị ihe kpatara ya;
o repịara ha, ma ha atụgharịa uche ha banyere ya.
42:3 Ya bụ, osisi achara
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.