Aịzaya 42:21
Isaiah 42:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị emeela ka iwu ya dị ukwuu, meekwa ka ọ dị ebube, nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ isite na ya mee ka ezi omume ya pụta ìhè.
Isaiah 42:21 in English
Isaiah 42:21 · Berean Standard Bible
The LORD was pleased, for the sake of His righteousness, to magnify His law and make it glorious.
Context
19Olee onye kpuru ìsì dịka ohu m?
Onye kwa ka ntị chiri dịka onyeozi nke eziokwu m?
Ọ dị onye ọzọ kpuru ìsì
dịka onye a m họpụtara ka ọ bụrụ ohu Onyenwe anyị? 20Ị hụla ọtụtụ ihe, ma ị dịghị atụkwasị uche gị na ha.
Ntị gị ghere oghe, ma ị dịghị eji ya anụ ihe.” 21Onyenwe anyị emeela ka iwu ya dị ukwuu,
meekwa ka ọ dị ebube,
nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ isite na ya mee ka ezi omume ya pụta ìhè. 22Ma e meela ka ndị ya bụrụ ndị e zukpọrọ ihe ha nwere nʼoge agha.
A kpọchikwara ha nʼolulu e gwuru nʼala,
zoo ha nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche.
Ha aghọọla ihe a kwatara nʼagha,
ma ọ dịghị onye na-anapụta ha.
Ha aghọkwaala ihe e si nʼaka mmadụ pụnara ya nʼike,
ma ọ dịghị onye na-asị ndị iro ha, “Nyeghachikwa m ihe m i ji aka ike were.” 23Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a?
Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.