Native Bible

Isaiah 42:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị hụla ọtụtụ ihe, ma ị dịghị atụkwasị uche gị na ha. Ntị gị ghere oghe, ma ị dịghị eji ya anụ ihe.”

Isaiah 42:20 in English

Isaiah 42:20 · Berean Standard Bible

Though seeing many things, you do not keep watch. Though your ears are open, you do not hear.”

Context

18“Geenụ ntị, unu ndị ntị chiri, leenụ anya unu ndị ìsì kpuru, ma hụ ụzọ. 19Olee onye kpuru ìsì dịka ohu m? Onye kwa ka ntị chiri dịka onyeozi nke eziokwu m? Ọ dị onye ọzọ kpuru ìsì dịka onye a m họpụtara ka ọ bụrụ ohu Onyenwe anyị? 20Ị hụla ọtụtụ ihe, ma ị dịghị atụkwasị uche gị na ha. Ntị gị ghere oghe, ma ị dịghị eji ya anụ ihe.” 21Onyenwe anyị emeela ka iwu ya dị ukwuu, meekwa ka ọ dị ebube, nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ isite na ya mee ka ezi omume ya pụta ìhè. 22Ma e meela ka ndị ya bụrụ ndị e zukpọrọ ihe ha nwere nʼoge agha. A kpọchikwara ha nʼolulu e gwuru nʼala, zoo ha nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ha aghọọla ihe a kwatara nʼagha, ma ọ dịghị onye na-anapụta ha. Ha aghọkwaala ihe e si nʼaka mmadụ pụnara ya nʼike, ma ọ dịghị onye na-asị ndị iro ha, “Nyeghachikwa m ihe m i ji aka ike were.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.