Aịzaya 42:18
Isaiah 42:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Geenụ ntị, unu ndị ntị chiri, leenụ anya unu ndị ìsì kpuru, ma hụ ụzọ.
Isaiah 42:18 in English
Isaiah 42:18 · Berean Standard Bible
Listen, you deaf ones; look, you blind ones, that you may see!
Context
16Aga m edu ndị kpuru ìsì, site nʼụzọ nke ha na-amaghị,
nʼokporoụzọ ha agatụbeghị ka m ga-edu ha;
Aga m eme ka ọchịchịrị ghọọ ìhè nʼihu ha,
meekwa ka ebe niile gbagọrọ agbagọ guzozie.
Ihe ndị a niile ka m ga-eme.
Agaghị m agbakụta ha azụ. 17Ma ndị niile na-atụkwasị arụsị obi,
ndị na-asị ihe ndị ahụ a pịrị apị, ‘Unu bụ chi anyị,’
a ga-achụghachi ha azụ nʼọnọdụ ihere. 18“Geenụ ntị, unu ndị ntị chiri,
leenụ anya unu ndị ìsì kpuru, ma hụ ụzọ. 19Olee onye kpuru ìsì dịka ohu m?
Onye kwa ka ntị chiri dịka onyeozi nke eziokwu m?
Ọ dị onye ọzọ kpuru ìsì
dịka onye a m họpụtara ka ọ bụrụ ohu Onyenwe anyị? 20Ị hụla ọtụtụ ihe, ma ị dịghị atụkwasị uche gị na ha.
Ntị gị ghere oghe, ma ị dịghị eji ya anụ ihe.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.