Aịzaya 42:24
Isaiah 42:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye weere Jekọb nyefee nʼaka ndị na-ebibi ihe, onye were Izrel nyefee ndị ohi? Ọ bụ na ọ bụghị Onyenwe anyị onye ha mehiere megide? Nʼihi na ha ekweghị eso ụzọ ya niile, ha erubeghị isi nye iwu ya.
Isaiah 42:24 in English
Isaiah 42:24 · Berean Standard Bible
Who gave Jacob up for spoil, and Israel to the plunderers? Was it not the LORD, against whom we have sinned? They were unwilling to walk in His ways, and they would not obey His law.
Context
22Ma e meela ka ndị ya bụrụ ndị e zukpọrọ ihe ha nwere nʼoge agha.
A kpọchikwara ha nʼolulu e gwuru nʼala,
zoo ha nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche.
Ha aghọọla ihe a kwatara nʼagha,
ma ọ dịghị onye na-anapụta ha.
Ha aghọkwaala ihe e si nʼaka mmadụ pụnara ya nʼike,
ma ọ dịghị onye na-asị ndị iro ha, “Nyeghachikwa m ihe m i ji aka ike were.” 23Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a?
Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu? 24Onye weere Jekọb nyefee nʼaka ndị na-ebibi ihe,
onye were Izrel nyefee ndị ohi?
Ọ bụ na ọ bụghị Onyenwe anyị
onye ha mehiere megide?
Nʼihi na ha ekweghị eso ụzọ ya niile,
ha erubeghị isi nye iwu ya. 25Ọ bụ ya mere o ji wụkwasị ndị ya iwe ọkụ ya,
ihe ike nke agha.
Ọ bụ ezie na iwe ya bịakwasịrị ha dịka ọkụ na-erepịa erepịa, ma ha aghọtaghị ihe kpatara ya;
o repịara ha, ma ha atụgharịa uche ha banyere ya.
42:3 Ya bụ, osisi achara
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.