Aịzaya 40:3
Isaiah 40:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu onye na-eti mkpu sị, “Dozienụ ụzọ nye Onyenwe anyị nʼime ọzara, meenụ ka ụzọ atụliri atụli guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị.
Isaiah 40:3 in English
Isaiah 40:3 · Berean Standard Bible
A voice of one calling: “Prepare the way for the LORD in the wilderness;* make a straight highway for our God in the desert.*
Context
1Kasịenụ ndị m obi, kasịenụ ha obi,
ka Chineke gị kwuru. 2Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu,
gwa ya;
na ụbọchị ọjọọ ya niile agwụla,
na a kwụzuola ụgwọ mmehie ya niile,
na o sitela nʼaka Onyenwe anyị
nata ụgwọ ọrụ karịrị okpukpu abụọ nke mmehie ya niile. 3Otu onye na-eti mkpu sị,
“Dozienụ ụzọ nye Onyenwe anyị
nʼime ọzara,
meenụ ka ụzọ atụliri atụli
guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị. 4A ga-eme ka ndagwurugwu ọbụla dị elu,
ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala,
ebe niile dị mkputamkpu ka a ga-eme ka o guzo kwem,
meekwa ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị. 5Nʼihi na a ga-ekpughepụ ebube Onyenwe anyị,
mmadụ niile ga-ahụkọkwa ya nʼotu.
Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.