Aịzaya 40:4
Isaiah 40:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-eme ka ndagwurugwu ọbụla dị elu, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala, ebe niile dị mkputamkpu ka a ga-eme ka o guzo kwem, meekwa ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị.
Isaiah 40:4 in English
Isaiah 40:4 · Berean Standard Bible
Every valley shall be lifted up, and every mountain and hill made low; the uneven ground will become smooth, and the rugged land a plain.*
Context
2Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu,
gwa ya;
na ụbọchị ọjọọ ya niile agwụla,
na a kwụzuola ụgwọ mmehie ya niile,
na o sitela nʼaka Onyenwe anyị
nata ụgwọ ọrụ karịrị okpukpu abụọ nke mmehie ya niile. 3Otu onye na-eti mkpu sị,
“Dozienụ ụzọ nye Onyenwe anyị
nʼime ọzara,
meenụ ka ụzọ atụliri atụli
guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị. 4A ga-eme ka ndagwurugwu ọbụla dị elu,
ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala,
ebe niile dị mkputamkpu ka a ga-eme ka o guzo kwem,
meekwa ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị. 5Nʼihi na a ga-ekpughepụ ebube Onyenwe anyị,
mmadụ niile ga-ahụkọkwa ya nʼotu.
Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.” 6Olu ahụ sịrị, “Tie mkpu!”
Ma ajụrụ m sị, “Gịnị ka m ga-eti?”
“Mmadụ niile dị ka ahịhịa,
ikwesi ntụkwasị obi ha niile dịkwa ka okoko osisi ọhịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.