Aịzaya 38:14
Isaiah 38:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa. Ana m asụ ude dịka nduru na-eru ụjụ. Ike gwụrụ anya m nʼihi ile anya nʼeluigwe. Anọ m nʼọnọdụ mkpagbu, Onyenwe anyị, bịa nyere m aka.”
Isaiah 38:14 in English
Isaiah 38:14 · Berean Standard Bible
I chirp like a swallow or crane; I moan like a dove. My eyes grow weak as I look upward. O Lord, I am oppressed; be my security.”
Context
12Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m
dịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ.
Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwa
o bipụla ndụ site nkwe-akwa,
ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa. 13Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ.
Ma dịka ọdụm ka ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile.
Ehihie na nʼabalị ka ị na-eme ka ndụ m gwụsịa. 14Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa.
Ana m asụ ude dịka nduru na-eru ụjụ.
Ike gwụrụ anya m nʼihi ile anya nʼeluigwe.
Anọ m nʼọnọdụ mkpagbu, Onyenwe anyị, bịa nyere m aka.” 15Ma gịnị ka m ga-ekwu?
Ya onwe ya gwara m sị na ọ bụ ya mere nke a.
M ga-eji obi umeala gagharịa ụbọchị ndụ m niile
nʼihi ihe mwute nke obi m. 16Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ.
Mmụọ m na-adịkwa ndụ nʼime ha.
I nyeghachila m ahụ ike,
mee ka m dị ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.