Aịzaya 38:13
Isaiah 38:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ. Ma dịka ọdụm ka ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile. Ehihie na nʼabalị ka ị na-eme ka ndụ m gwụsịa.
Isaiah 38:13 in English
Isaiah 38:13 · Berean Standard Bible
I composed myself * until the morning. Like a lion He breaks all my bones; from day until night You make an end of me.
Context
11Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ
nʼala ndị dị ndụ,
m gaghị elegidekwa mmadụ ibe m anya ọzọ,
maọbụ bie nʼetiti ndị bi nʼime ụwa a. 12Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m
dịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ.
Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwa
o bipụla ndụ site nkwe-akwa,
ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa. 13Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ.
Ma dịka ọdụm ka ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile.
Ehihie na nʼabalị ka ị na-eme ka ndụ m gwụsịa. 14Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa.
Ana m asụ ude dịka nduru na-eru ụjụ.
Ike gwụrụ anya m nʼihi ile anya nʼeluigwe.
Anọ m nʼọnọdụ mkpagbu, Onyenwe anyị, bịa nyere m aka.” 15Ma gịnị ka m ga-ekwu?
Ya onwe ya gwara m sị na ọ bụ ya mere nke a.
M ga-eji obi umeala gagharịa ụbọchị ndụ m niile
nʼihi ihe mwute nke obi m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.