Native Bible

Isaiah 38:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m dịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ. Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwa o bipụla ndụ site nkwe-akwa, ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa.

Isaiah 38:12 in English

Isaiah 38:12 · Berean Standard Bible

My dwelling has been picked up and removed from me like a shepherd’s tent. I have rolled up my life like a weaver; He cuts me off from the loom; from day until night You make an end of me.

Context

10Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa ka m ga-agabiga nʼọnụ ụzọ nke ọnwụ, bụrụ onye anapụrụ oge ndụ m nke fọdụrụ afọdụ?” 11Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ nʼala ndị dị ndụ, m gaghị elegidekwa mmadụ ibe m anya ọzọ, maọbụ bie nʼetiti ndị bi nʼime ụwa a. 12Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m dịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ. Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwa o bipụla ndụ site nkwe-akwa, ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa. 13Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ. Ma dịka ọdụm ka ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile. Ehihie na nʼabalị ka ị na-eme ka ndụ m gwụsịa. 14Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa. Ana m asụ ude dịka nduru na-eru ụjụ. Ike gwụrụ anya m nʼihi ile anya nʼeluigwe. Anọ m nʼọnọdụ mkpagbu, Onyenwe anyị, bịa nyere m aka.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.