Aịzaya 38:12
Isaiah 38:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m dịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ. Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwa o bipụla ndụ site nkwe-akwa, ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa.
Isaiah 38:12 in English
Isaiah 38:12 · Berean Standard Bible
My dwelling has been picked up and removed from me like a shepherd’s tent. I have rolled up my life like a weaver; He cuts me off from the loom; from day until night You make an end of me.
Context
10Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa
ka m ga-agabiga nʼọnụ ụzọ nke ọnwụ,
bụrụ onye anapụrụ oge ndụ m nke fọdụrụ afọdụ?” 11Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ
nʼala ndị dị ndụ,
m gaghị elegidekwa mmadụ ibe m anya ọzọ,
maọbụ bie nʼetiti ndị bi nʼime ụwa a. 12Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m
dịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ.
Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwa
o bipụla ndụ site nkwe-akwa,
ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa. 13Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ.
Ma dịka ọdụm ka ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile.
Ehihie na nʼabalị ka ị na-eme ka ndụ m gwụsịa. 14Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa.
Ana m asụ ude dịka nduru na-eru ụjụ.
Ike gwụrụ anya m nʼihi ile anya nʼeluigwe.
Anọ m nʼọnọdụ mkpagbu, Onyenwe anyị, bịa nyere m aka.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.