Aịzaya 38:16
Isaiah 38:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ. Mmụọ m na-adịkwa ndụ nʼime ha. I nyeghachila m ahụ ike, mee ka m dị ndụ.
Isaiah 38:16 in English
Isaiah 38:16 · Berean Standard Bible
O Lord, by such things men live, and in all of them my spirit finds life. You have restored me to health and have let me live.
Context
14Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa.
Ana m asụ ude dịka nduru na-eru ụjụ.
Ike gwụrụ anya m nʼihi ile anya nʼeluigwe.
Anọ m nʼọnọdụ mkpagbu, Onyenwe anyị, bịa nyere m aka.” 15Ma gịnị ka m ga-ekwu?
Ya onwe ya gwara m sị na ọ bụ ya mere nke a.
M ga-eji obi umeala gagharịa ụbọchị ndụ m niile
nʼihi ihe mwute nke obi m. 16Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ.
Mmụọ m na-adịkwa ndụ nʼime ha.
I nyeghachila m ahụ ike,
mee ka m dị ndụ. 17Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m,
ka m ji taa ahụhụ nke ihe mgbu dị otu a.
Nʼịhụnanya gị ka ị zọpụtara m
site nʼolulu nke ịla nʼiyi.
I werela mmehie m niile
wefee nʼazụ gị. 18Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị,
ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto.
Ndị na-arịda nʼolulu
agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.