Aịzaya 38:17
Isaiah 38:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m, ka m ji taa ahụhụ nke ihe mgbu dị otu a. Nʼịhụnanya gị ka ị zọpụtara m site nʼolulu nke ịla nʼiyi. I werela mmehie m niile wefee nʼazụ gị.
Isaiah 38:17 in English
Isaiah 38:17 · Berean Standard Bible
Surely for my own welfare I had such great anguish; but Your love has delivered me from the pit of oblivion, for You have cast all my sins behind Your back.
Context
15Ma gịnị ka m ga-ekwu?
Ya onwe ya gwara m sị na ọ bụ ya mere nke a.
M ga-eji obi umeala gagharịa ụbọchị ndụ m niile
nʼihi ihe mwute nke obi m. 16Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ.
Mmụọ m na-adịkwa ndụ nʼime ha.
I nyeghachila m ahụ ike,
mee ka m dị ndụ. 17Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m,
ka m ji taa ahụhụ nke ihe mgbu dị otu a.
Nʼịhụnanya gị ka ị zọpụtara m
site nʼolulu nke ịla nʼiyi.
I werela mmehie m niile
wefee nʼazụ gị. 18Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị,
ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto.
Ndị na-arịda nʼolulu
agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị. 19Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto,
dị ka m na-eme taa.
Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso ha
mata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.