Aịzaya 38:19
Isaiah 38:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto, dị ka m na-eme taa. Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso ha mata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị.
Isaiah 38:19 in English
Isaiah 38:19 · Berean Standard Bible
The living, only the living, can thank You, as I do today; fathers will tell their children about Your faithfulness.
Context
17Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m,
ka m ji taa ahụhụ nke ihe mgbu dị otu a.
Nʼịhụnanya gị ka ị zọpụtara m
site nʼolulu nke ịla nʼiyi.
I werela mmehie m niile
wefee nʼazụ gị. 18Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị,
ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto.
Ndị na-arịda nʼolulu
agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị. 19Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto,
dị ka m na-eme taa.
Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso ha
mata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị. 20Onyenwe anyị ga-azọpụta m,
anyị ga-abụ abụ kpọọ ụbọ akwara
nʼụbọchị niile nke ndụ anyị,
nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 21Aịzaya ekwuolarị sị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ tee ya nʼelu etuto ahụ, ahụ ga-adịkwa ya mma.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.