Aịzaya 32:9
Isaiah 32:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ndị inyom na-ebi ndụ ndị afọ juru, bilie ọtọ, gee m ntị; unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi, nụrụnụ ihe m nwere ikwu.
Isaiah 32:9 in English
Isaiah 32:9 · Berean Standard Bible
Stand up, you complacent women; listen to me. Give ear to my word, you overconfident daughters.
Context
7Ndị ọjọọ na-eji ụzọ aghụghọ niile eme ihe ọjọọ,
ha na-echepụta nzube ajọ ihe niile,
iji okwu ụgha laa onye ogbenye nʼiyi,
ọ bụladị mgbe arịrịọ nke onye ahụ nọ na mkpa bụ nke ziri ezi. 8Ma onye a na-asọpụrụ na-atụpụta atụmatụ dị ezi mma,
ọ na-eguzokwa chịm nye ezi ihe. 9Unu ndị inyom na-ebi ndụ ndị afọ juru,
bilie ọtọ, gee m ntị;
unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi,
nụrụnụ ihe m nwere ikwu. 10Nʼoge na-adịghị anya, mgbe otu afọ na abalị ole na ole gasịrị,
unu bụ ndị nwere ntụkwasị obi ga-ama jijiji;
nʼihi na mkpụrụ ubi vaịnị unu ga-emebi,
owuwe mkpụrụ ihe ubi agaghị abịa. 11Maanụ jijiji, unu ndị inyom afọ juru,
tụọ egwu unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi.
Yipụnụ uwe ọma unu,
kekwasịnụ onwe unu akwa mkpe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.