Aịzaya 32:11
Isaiah 32:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Maanụ jijiji, unu ndị inyom afọ juru, tụọ egwu unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi. Yipụnụ uwe ọma unu, kekwasịnụ onwe unu akwa mkpe.
Isaiah 32:11 in English
Isaiah 32:11 · Berean Standard Bible
Shudder, you ladies of leisure; tremble, you daughters of complacency. Strip yourselves bare and put sackcloth around your waists.
Context
9Unu ndị inyom na-ebi ndụ ndị afọ juru,
bilie ọtọ, gee m ntị;
unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi,
nụrụnụ ihe m nwere ikwu. 10Nʼoge na-adịghị anya, mgbe otu afọ na abalị ole na ole gasịrị,
unu bụ ndị nwere ntụkwasị obi ga-ama jijiji;
nʼihi na mkpụrụ ubi vaịnị unu ga-emebi,
owuwe mkpụrụ ihe ubi agaghị abịa. 11Maanụ jijiji, unu ndị inyom afọ juru,
tụọ egwu unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi.
Yipụnụ uwe ọma unu,
kekwasịnụ onwe unu akwa mkpe. 12Tienụ aka nʼobi nʼihi ubi unu na-enye afọ ojuju,
nʼihi osisi vaịnị na-amị mkpụrụ. 13Nʼihi na ogwu na uke ga-epupụta nʼala unu.
Ruonụ uju, nʼihi na ụlọ niile unu na-anọ nʼime ya enwe obi ụtọ,
na obodo niile unu na-anọ nʼime ya na-eri, na-aṅụ
agakwaghị adị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.