Aịzaya 32:12
Isaiah 32:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tienụ aka nʼobi nʼihi ubi unu na-enye afọ ojuju, nʼihi osisi vaịnị na-amị mkpụrụ.
Isaiah 32:12 in English
Isaiah 32:12 · Berean Standard Bible
Beat your breasts for the pleasant fields, for the fruitful vines,
Context
10Nʼoge na-adịghị anya, mgbe otu afọ na abalị ole na ole gasịrị,
unu bụ ndị nwere ntụkwasị obi ga-ama jijiji;
nʼihi na mkpụrụ ubi vaịnị unu ga-emebi,
owuwe mkpụrụ ihe ubi agaghị abịa. 11Maanụ jijiji, unu ndị inyom afọ juru,
tụọ egwu unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi.
Yipụnụ uwe ọma unu,
kekwasịnụ onwe unu akwa mkpe. 12Tienụ aka nʼobi nʼihi ubi unu na-enye afọ ojuju,
nʼihi osisi vaịnị na-amị mkpụrụ. 13Nʼihi na ogwu na uke ga-epupụta nʼala unu.
Ruonụ uju, nʼihi na ụlọ niile unu na-anọ nʼime ya enwe obi ụtọ,
na obodo niile unu na-anọ nʼime ya na-eri, na-aṅụ
agakwaghị adị. 14Nʼihi na a ga-ahapụ ebe niile e wusiri ike,
gbahapụkwa obodo ahụ ụzụ na-adị nʼime ya;
ụlọ elu nche niile na ebe niile ewusiri ike ga-abụ ebe ga-atọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi,
ha ga-aghọ ebe ịnyịnya ibu ọhịa ga na-enwe obi ụtọ, na ebe igwe anụ ụlọ ga na-akpa nri ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.