Native Bible

Isaiah 32:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A ga-emekwa ka ikpe ziri ezi ga-ebi nʼọzara,* ezi omume ga-adịkwa nʼubi ọma ahụ.

Isaiah 32:16 in English

Isaiah 32:16 · Berean Standard Bible

Then justice will inhabit the wilderness, and righteousness will dwell in the fertile field.

Context

14Nʼihi na a ga-ahapụ ebe niile e wusiri ike, gbahapụkwa obodo ahụ ụzụ na-adị nʼime ya; ụlọ elu nche niile na ebe niile ewusiri ike ga-abụ ebe ga-atọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi, ha ga-aghọ ebe ịnyịnya ibu ọhịa ga na-enwe obi ụtọ, na ebe igwe anụ ụlọ ga na-akpa nri ha. 15Ha niile ga-adịgide otu a tutu ruo mgbe a ga-esite nʼeluigwe wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ. Mgbe ahụ ọzara ga-aghọ ala ubi mara mma, ala ubi ọma ahụ ga-adịkwa ka ọhịa. 16A ga-emekwa ka ikpe ziri ezi ga-ebi nʼọzara,* ezi omume ga-adịkwa nʼubi ọma ahụ. 17Mkpụrụ nke ezi omume ahụ ga-abụ udo; ihe ga-esikwa na ya pụta ga-abụ ị nọ jụụ na ntụkwasị obi mgbe niile ebighị ebi. 18Ndị m ga-ebi nʼebe obibi nke udo, nʼụlọ nwere ezi nchekwa, nʼebe izuike nke nsogbu na-adịghị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.