Native Bible

Isaiah 32:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha niile ga-adịgide otu a tutu ruo mgbe a ga-esite nʼeluigwe wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ. Mgbe ahụ ọzara ga-aghọ ala ubi mara mma, ala ubi ọma ahụ ga-adịkwa ka ọhịa.

Isaiah 32:15 in English

Isaiah 32:15 · Berean Standard Bible

until the Spirit is poured out upon us from on high. Then the desert will be an orchard, and the orchard will seem like a forest.

Context

13Nʼihi na ogwu na uke ga-epupụta nʼala unu. Ruonụ uju, nʼihi na ụlọ niile unu na-anọ nʼime ya enwe obi ụtọ, na obodo niile unu na-anọ nʼime ya na-eri, na-aṅụ agakwaghị adị. 14Nʼihi na a ga-ahapụ ebe niile e wusiri ike, gbahapụkwa obodo ahụ ụzụ na-adị nʼime ya; ụlọ elu nche niile na ebe niile ewusiri ike ga-abụ ebe ga-atọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi, ha ga-aghọ ebe ịnyịnya ibu ọhịa ga na-enwe obi ụtọ, na ebe igwe anụ ụlọ ga na-akpa nri ha. 15Ha niile ga-adịgide otu a tutu ruo mgbe a ga-esite nʼeluigwe wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ. Mgbe ahụ ọzara ga-aghọ ala ubi mara mma, ala ubi ọma ahụ ga-adịkwa ka ọhịa. 16A ga-emekwa ka ikpe ziri ezi ga-ebi nʼọzara,* ezi omume ga-adịkwa nʼubi ọma ahụ. 17Mkpụrụ nke ezi omume ahụ ga-abụ udo; ihe ga-esikwa na ya pụta ga-abụ ị nọ jụụ na ntụkwasị obi mgbe niile ebighị ebi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.