Aịzaya 3:6
Isaiah 3:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu nwoke ga-ejide nwanne ya nwoke nʼụlọ nna ya sị ya, “I nwere akwa mgbochi, bụrụ onyendu anyị; lekọta mkpọmkpọ ebe a anya.”
Isaiah 3:6 in English
Isaiah 3:6 · Berean Standard Bible
A man will seize his brother within his father’s house: “You have a cloak—you be our leader! Take charge of this heap of rubble.”
Context
4“Aga m eme ka ụmụ okorobịa ghọọ ndị ozi ha,
meekwa ka ụmụ na-aṅụ ara bụrụ ndị ịchị isi dị nʼaka ha.” 5Ndị mmadụ ga-emegbu ibe ha,
otu onye megide onye ọzọ, onye agbataobi megide onye agbataobi ibe ya.
Ụmụ okorobịa ga-ebili megide ndị okenye,
ndị a na-elelị ga-emegide ndị a na-asọpụrụ. 6Otu nwoke ga-ejide nwanne ya nwoke
nʼụlọ nna ya sị ya,
“I nwere akwa mgbochi, bụrụ onyendu anyị;
lekọta mkpọmkpọ ebe a anya.” 7Ma ọ ga-azaghachi nʼụbọchị ahụ sị,
“O nweghị ihe m pụrụ ime.
Enweghị m nri maọbụ akwa mgbochi nʼụlọ m.
Emela m onyendu ndị a.” 8Lee na Jerusalem na-asọ ngọngọ.
Juda na-adakwa.*
Nʼihi na ndị bi nʼime ya ekwujọọla Onyenwe anyị.
Ha na-elelịkwa, ma na-enupu isi nʼebube Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.