Native Bible

Isaiah 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị mmadụ ga-emegbu ibe ha, otu onye megide onye ọzọ, onye agbataobi megide onye agbataobi ibe ya. Ụmụ okorobịa ga-ebili megide ndị okenye, ndị a na-elelị ga-emegide ndị a na-asọpụrụ.

Isaiah 3:5 in English

Isaiah 3:5 · Berean Standard Bible

The people will oppress one another, man against man, neighbor against neighbor; the young will rise up against the old, and the base against the honorable.

Context

3na onyeisi agha na-achị ndị agha iri ise, na onye a na-asọpụrụ, na onye ndụmọdụ, na onye ọka maara ọrụ, na onye nwere ezi mmụọ nghọta ịkọ mmadụ ibe ya ọgwụ. 4“Aga m eme ka ụmụ okorobịa ghọọ ndị ozi ha, meekwa ka ụmụ na-aṅụ ara bụrụ ndị ịchị isi dị nʼaka ha.” 5Ndị mmadụ ga-emegbu ibe ha, otu onye megide onye ọzọ, onye agbataobi megide onye agbataobi ibe ya. Ụmụ okorobịa ga-ebili megide ndị okenye, ndị a na-elelị ga-emegide ndị a na-asọpụrụ. 6Otu nwoke ga-ejide nwanne ya nwoke nʼụlọ nna ya sị ya, “I nwere akwa mgbochi, bụrụ onyendu anyị; lekọta mkpọmkpọ ebe a anya.” 7Ma ọ ga-azaghachi nʼụbọchị ahụ sị, “O nweghị ihe m pụrụ ime. Enweghị m nri maọbụ akwa mgbochi nʼụlọ m. Emela m onyendu ndị a.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.