Aịzaya 3:5
Isaiah 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị mmadụ ga-emegbu ibe ha, otu onye megide onye ọzọ, onye agbataobi megide onye agbataobi ibe ya. Ụmụ okorobịa ga-ebili megide ndị okenye, ndị a na-elelị ga-emegide ndị a na-asọpụrụ.
Isaiah 3:5 in English
Isaiah 3:5 · Berean Standard Bible
The people will oppress one another, man against man, neighbor against neighbor; the young will rise up against the old, and the base against the honorable.
Context
3na onyeisi agha na-achị ndị agha iri ise, na onye a na-asọpụrụ,
na onye ndụmọdụ, na onye ọka maara ọrụ, na onye nwere ezi mmụọ nghọta ịkọ mmadụ ibe ya ọgwụ. 4“Aga m eme ka ụmụ okorobịa ghọọ ndị ozi ha,
meekwa ka ụmụ na-aṅụ ara bụrụ ndị ịchị isi dị nʼaka ha.” 5Ndị mmadụ ga-emegbu ibe ha,
otu onye megide onye ọzọ, onye agbataobi megide onye agbataobi ibe ya.
Ụmụ okorobịa ga-ebili megide ndị okenye,
ndị a na-elelị ga-emegide ndị a na-asọpụrụ. 6Otu nwoke ga-ejide nwanne ya nwoke
nʼụlọ nna ya sị ya,
“I nwere akwa mgbochi, bụrụ onyendu anyị;
lekọta mkpọmkpọ ebe a anya.” 7Ma ọ ga-azaghachi nʼụbọchị ahụ sị,
“O nweghị ihe m pụrụ ime.
Enweghị m nri maọbụ akwa mgbochi nʼụlọ m.
Emela m onyendu ndị a.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.