Aịzaya 3:8
Isaiah 3:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee na Jerusalem na-asọ ngọngọ. Juda na-adakwa.* Nʼihi na ndị bi nʼime ya ekwujọọla Onyenwe anyị. Ha na-elelịkwa, ma na-enupu isi nʼebube Onyenwe anyị.
Isaiah 3:8 in English
Isaiah 3:8 · Berean Standard Bible
For Jerusalem has stumbled and Judah has fallen because they spoke and acted against the LORD, defying His glorious presence.*
Context
6Otu nwoke ga-ejide nwanne ya nwoke
nʼụlọ nna ya sị ya,
“I nwere akwa mgbochi, bụrụ onyendu anyị;
lekọta mkpọmkpọ ebe a anya.” 7Ma ọ ga-azaghachi nʼụbọchị ahụ sị,
“O nweghị ihe m pụrụ ime.
Enweghị m nri maọbụ akwa mgbochi nʼụlọ m.
Emela m onyendu ndị a.” 8Lee na Jerusalem na-asọ ngọngọ.
Juda na-adakwa.*
Nʼihi na ndị bi nʼime ya ekwujọọla Onyenwe anyị.
Ha na-elelịkwa, ma na-enupu isi nʼebube Onyenwe anyị. 9Ihu ha na-egosi ihe ha bụ. Ọ na-ezipụta ajọ omume ha.
Ha na-anya isi nʼime mmehie ha dịka Sọdọm.
Ihere adịghịkwa eme ha.
Ahụhụ ga-adịrị ha,
nʼihi na ha ejirila aka ha kpatara onwe ha ahụhụ. 10Zie ndị ezi omume niile ozi sị ha, na ihe ga-agara ha nke ọma,
nʼihi na mkpụrụ sitere nʼomume ha niile ka ha ga-eri.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.