Aịzaya 3:9
Isaiah 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihu ha na-egosi ihe ha bụ. Ọ na-ezipụta ajọ omume ha. Ha na-anya isi nʼime mmehie ha dịka Sọdọm. Ihere adịghịkwa eme ha. Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha ejirila aka ha kpatara onwe ha ahụhụ.
Isaiah 3:9 in English
Isaiah 3:9 · Berean Standard Bible
The expression on their faces testifies against them, and like Sodom they flaunt their sin; they do not conceal it. Woe to them, for they have brought disaster upon themselves.
Context
7Ma ọ ga-azaghachi nʼụbọchị ahụ sị,
“O nweghị ihe m pụrụ ime.
Enweghị m nri maọbụ akwa mgbochi nʼụlọ m.
Emela m onyendu ndị a.” 8Lee na Jerusalem na-asọ ngọngọ.
Juda na-adakwa.*
Nʼihi na ndị bi nʼime ya ekwujọọla Onyenwe anyị.
Ha na-elelịkwa, ma na-enupu isi nʼebube Onyenwe anyị. 9Ihu ha na-egosi ihe ha bụ. Ọ na-ezipụta ajọ omume ha.
Ha na-anya isi nʼime mmehie ha dịka Sọdọm.
Ihere adịghịkwa eme ha.
Ahụhụ ga-adịrị ha,
nʼihi na ha ejirila aka ha kpatara onwe ha ahụhụ. 10Zie ndị ezi omume niile ozi sị ha, na ihe ga-agara ha nke ọma,
nʼihi na mkpụrụ sitere nʼomume ha niile ka ha ga-eri.* 11Ma gwa ndị na-emebi iwu na ahụhụ dịrị ha.
Mbibi adakwasịla ha!
Ha ga-eketa oke ruoru ha,
nʼihi ihe aka ha kpataara ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.