Aịzaya 29:3
Isaiah 29:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu, aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburu dokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị.
Isaiah 29:3 in English
Isaiah 29:3 · Berean Standard Bible
I will camp in a circle around you; I will besiege you with towers and set up siege works against you.
Context
1Ahụhụ ga-adịrị gị, gị bụ Ariel, Ariel,*
gị obodo ebe Devid bi.
Gbakọnyenụ otu afọ nʼafọ ọzọ
nke unu ga-eji rie oriri, mee mmemme. 2Ma aga m akpagbu Ariel,
ọ ga-eru ụjụ, ma bee akwa,
ọ ga-adị ka ala ebe ịchụ aja. 3Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu,
aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburu
dokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị. 4Nʼọnọdụ mweda nʼala, ị ga-ekwu okwu site nʼala,
okwu ọnụ gị ga-esikwa nʼuzuzu pụta.
Olu gị ga-ada ka nke onye mmụọ site nʼala,
ọ bụ site nʼuzuzu ka okwu ọnụ gị na-ada ntakịrị ntakịrị ga-esi pụta. 5Ma igwe ndị iro gị* ga-aghọ ntụ,
igwe ndị na-adịghị eme obi ebere ga-adịkwa ka igbugbo ọka nke ifufe na-ebufu.
Mgbe ahụ, na mberede,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.