Aịzaya 29:2
Isaiah 29:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma aga m akpagbu Ariel, ọ ga-eru ụjụ, ma bee akwa, ọ ga-adị ka ala ebe ịchụ aja.
Isaiah 29:2 in English
Isaiah 29:2 · Berean Standard Bible
And I will constrain Ariel, and there will be mourning and lamentation; she will be like an altar hearth * before Me.
Context
1Ahụhụ ga-adịrị gị, gị bụ Ariel, Ariel,*
gị obodo ebe Devid bi.
Gbakọnyenụ otu afọ nʼafọ ọzọ
nke unu ga-eji rie oriri, mee mmemme. 2Ma aga m akpagbu Ariel,
ọ ga-eru ụjụ, ma bee akwa,
ọ ga-adị ka ala ebe ịchụ aja. 3Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu,
aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburu
dokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị. 4Nʼọnọdụ mweda nʼala, ị ga-ekwu okwu site nʼala,
okwu ọnụ gị ga-esikwa nʼuzuzu pụta.
Olu gị ga-ada ka nke onye mmụọ site nʼala,
ọ bụ site nʼuzuzu ka okwu ọnụ gị na-ada ntakịrị ntakịrị ga-esi pụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.