Aịzaya 29:5
Isaiah 29:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma igwe ndị iro gị* ga-aghọ ntụ, igwe ndị na-adịghị eme obi ebere ga-adịkwa ka igbugbo ọka nke ifufe na-ebufu. Mgbe ahụ, na mberede,
Isaiah 29:5 in English
Isaiah 29:5 · Berean Standard Bible
But your many foes will be like fine dust, the multitude of the ruthless like blowing chaff. Then suddenly, in an instant,
Context
3Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu,
aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburu
dokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị. 4Nʼọnọdụ mweda nʼala, ị ga-ekwu okwu site nʼala,
okwu ọnụ gị ga-esikwa nʼuzuzu pụta.
Olu gị ga-ada ka nke onye mmụọ site nʼala,
ọ bụ site nʼuzuzu ka okwu ọnụ gị na-ada ntakịrị ntakịrị ga-esi pụta. 5Ma igwe ndị iro gị* ga-aghọ ntụ,
igwe ndị na-adịghị eme obi ebere ga-adịkwa ka igbugbo ọka nke ifufe na-ebufu.
Mgbe ahụ, na mberede, 6mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị,
Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji egbe eluigwe na ala ọma jijiji
na oke ifufe na oke ụzụ, na ọkụ na-erepịa erepịa, bịakwute ha. 7Mba niile ahụ, ndị na-ebuso Ariel agha,
bụ ndị na-ebuso ya na ebe ya e wusiri ike agha,
ga-efu dịka nrọ,
onye na-arahụ ụra nʼabalị rọrọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.