Native Bible

Isaiah 28:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Okpueze okoko osisi, bụ mpako nke ndị Ifrem na-aṅụbiga mmanya oke, ga-abụ ihe a ga-azọtọkwa nʼokpuru ụkwụ.

Isaiah 28:3 in English

Isaiah 28:3 · Berean Standard Bible

The majestic crown of Ephraim’s drunkards will be trampled underfoot.

Context

1Ahụhụ ga-adịrị okpueze okoko* ọhịa ahụ, nke bụ mpako Ifrem, obodo ahụ ndị ya na-aṅụbiga mmanya oke ji anya isi. Obodo ahụ e wukwasịrị na mbara ala ndagwurugwu mara mma. Obodo ahụ ịma mma ya na-ada dịka okoko osisi e kpukwasịrị ndị ndu ya mmanya na-egbu nʼisi. 2Lee, Onyenwe anyị nwere otu onye dị ike,* onye nwekwara ume, dịka oke mmiri ozuzu nke akụmmiri igwe na dịka oke ifufe na-eweta mbibi, dịka oke mmiri ozuzo na-erubiga oke na dịka oke mmiri ozuzo bu idee mmiri ji ike ekwo, ọ ga-eji ike tụpụ ya nʼala. 3Okpueze okoko osisi, bụ mpako nke ndị Ifrem na-aṅụbiga mmanya oke, ga-abụ ihe a ga-azọtọkwa nʼokpuru ụkwụ. 4Okoko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ, nke bụ ebube ịma mma ya, nke dị nʼisi ndagwurugwu na-emepụta ihe, ga-adị ka mkpụrụ fiig chara tupu oge owuwe ihe ubi eruo, nke mgbe onye ọbụla hụrụ ha na-ewere ha nʼaka, tinye nʼọnụ ya, loo ha. 5Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nʼonwe ya, ga-aghọrọ ndị ya fọdụrụ nʼala ahụ okpueze mara mma, ọ ga-aghọkwara ha okoko mara mma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.