Aịzaya 28:2
Isaiah 28:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, Onyenwe anyị nwere otu onye dị ike,* onye nwekwara ume, dịka oke mmiri ozuzu nke akụmmiri igwe na dịka oke ifufe na-eweta mbibi, dịka oke mmiri ozuzo na-erubiga oke na dịka oke mmiri ozuzo bu idee mmiri ji ike ekwo, ọ ga-eji ike tụpụ ya nʼala.
Isaiah 28:2 in English
Isaiah 28:2 · Berean Standard Bible
Behold, the Lord has one who is strong and mighty. Like a hailstorm or destructive tempest, like a driving rain or flooding downpour, he will smash that crown to the ground.
Context
1Ahụhụ ga-adịrị okpueze okoko* ọhịa ahụ, nke bụ mpako Ifrem,
obodo ahụ ndị ya na-aṅụbiga mmanya oke ji anya isi.
Obodo ahụ e wukwasịrị na mbara ala ndagwurugwu mara mma.
Obodo ahụ ịma mma ya na-ada dịka okoko osisi e kpukwasịrị ndị ndu ya mmanya na-egbu nʼisi. 2Lee, Onyenwe anyị nwere otu onye dị ike,* onye nwekwara ume,
dịka oke mmiri ozuzu nke akụmmiri igwe na dịka oke ifufe na-eweta mbibi,
dịka oke mmiri ozuzo na-erubiga oke na dịka oke mmiri ozuzo bu idee mmiri ji ike ekwo,
ọ ga-eji ike tụpụ ya nʼala. 3Okpueze okoko osisi, bụ mpako nke ndị Ifrem na-aṅụbiga mmanya oke,
ga-abụ ihe a ga-azọtọkwa nʼokpuru ụkwụ. 4Okoko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ, nke bụ ebube ịma mma ya,
nke dị nʼisi ndagwurugwu na-emepụta ihe,
ga-adị ka mkpụrụ fiig chara tupu oge owuwe ihe ubi eruo,
nke mgbe onye ọbụla hụrụ ha na-ewere ha nʼaka,
tinye nʼọnụ ya, loo ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.