Aịzaya 28:13
Isaiah 28:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu Onyenwe anyị nʼahịrị nʼahịrị, nʼusoro nʼusoro; nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ, ka unu gaa sụọ ngọngọ dalaa azụ, ka unu bụrụ ndị e tihịara ahụ, ndị ọnya mara, ndị e jidekwara.
Isaiah 28:13 in English
Isaiah 28:13 · Berean Standard Bible
Then the word of the LORD to them will become: “Order on order, order on order, line on line, line on line; a little here, a little there,” so that they will go stumbling backward and will be injured, ensnared, and captured.
Context
11Nʼezie, Chineke ga-eji ndị na-asụ asụsụ unu na-amaghị
zi unu ihe. 12Nʼihi na ọ gwara unu okwu sị,
“Lee, nke a bụ ebe izuike ahụ, ebe onye ike gwụrụ nwere ike ịnọ zuru ike;
nke a bụ ebe ịgbaume ahụ.”
Ma ha jụrụ ige ya ntị. 13Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu Onyenwe anyị
nʼahịrị nʼahịrị,
nʼusoro nʼusoro;
nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ,
ka unu gaa sụọ ngọngọ dalaa azụ,
ka unu bụrụ ndị e tihịara ahụ, ndị ọnya mara, ndị e jidekwara. 14Nʼihi nke a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-akwa emo,
ndị ọchịchị Jerusalem dị nʼaka. 15Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ,
anyị na ala mmụọ enwekọọkwala otu mkpebi.
Mgbe ịla nʼiyi ahụ dị ukwuu ga-esi nʼebe anyị nọ gafee,
ọ gaghị erute anyị,
nʼihi na anyị emeela ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị;
ọ bụkwa nʼime okwu ụgha ka anyị na-ezo onwe anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.