Aịzaya 28:15
Isaiah 28:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ, anyị na ala mmụọ enwekọọkwala otu mkpebi. Mgbe ịla nʼiyi ahụ dị ukwuu ga-esi nʼebe anyị nọ gafee, ọ gaghị erute anyị, nʼihi na anyị emeela ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị; ọ bụkwa nʼime okwu ụgha ka anyị na-ezo onwe anyị.”
Isaiah 28:15 in English
Isaiah 28:15 · Berean Standard Bible
For you said, “We have made a covenant with death; we have fashioned an agreement with Sheol. When the overwhelming scourge passes through it will not touch us, because we have made lies our refuge and falsehood * our hiding place.”
Context
13Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu Onyenwe anyị
nʼahịrị nʼahịrị,
nʼusoro nʼusoro;
nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ,
ka unu gaa sụọ ngọngọ dalaa azụ,
ka unu bụrụ ndị e tihịara ahụ, ndị ọnya mara, ndị e jidekwara. 14Nʼihi nke a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-akwa emo,
ndị ọchịchị Jerusalem dị nʼaka. 15Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ,
anyị na ala mmụọ enwekọọkwala otu mkpebi.
Mgbe ịla nʼiyi ahụ dị ukwuu ga-esi nʼebe anyị nọ gafee,
ọ gaghị erute anyị,
nʼihi na anyị emeela ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị;
ọ bụkwa nʼime okwu ụgha ka anyị na-ezo onwe anyị.” 16Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,
“Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke anwapụtarala.
Nkume nkuku dị oke ọnụahịa, nʼihi ntọala siri ike.*
Onye nke kweere na ya
egwu agaghị ejide ya.* 17Ikpe ziri ezi ga-abụ eriri ọtụtụ nke ji atụ ihe,
ezi omume ga-abụkwa ihe ịtụ mgbidi;
akụmmiri nke oke mmiri ozuzo, ga-ekpochapụ ebe mgbaba unu, okwu ụgha unu,
mmiri ga-etojukwa nʼebe nzuzo unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.