Native Bible

Isaiah 28:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ikpe ziri ezi ga-abụ eriri ọtụtụ nke ji atụ ihe, ezi omume ga-abụkwa ihe ịtụ mgbidi; akụmmiri nke oke mmiri ozuzo, ga-ekpochapụ ebe mgbaba unu, okwu ụgha unu, mmiri ga-etojukwa nʼebe nzuzo unu.

Isaiah 28:17 in English

Isaiah 28:17 · Berean Standard Bible

I will make justice the measuring line and righteousness the level. Hail will sweep away your refuge of lies, and water will flood your hiding place.

Context

15Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ, anyị na ala mmụọ enwekọọkwala otu mkpebi. Mgbe ịla nʼiyi ahụ dị ukwuu ga-esi nʼebe anyị nọ gafee, ọ gaghị erute anyị, nʼihi na anyị emeela ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị; ọ bụkwa nʼime okwu ụgha ka anyị na-ezo onwe anyị.” 16Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke anwapụtarala. Nkume nkuku dị oke ọnụahịa, nʼihi ntọala siri ike.* Onye nke kweere na ya egwu agaghị ejide ya.* 17Ikpe ziri ezi ga-abụ eriri ọtụtụ nke ji atụ ihe, ezi omume ga-abụkwa ihe ịtụ mgbidi; akụmmiri nke oke mmiri ozuzo, ga-ekpochapụ ebe mgbaba unu, okwu ụgha unu, mmiri ga-etojukwa nʼebe nzuzo unu. 18Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara; mkpebi unu na ala mmụọ agaghị eguzokwa. Mgbe oke ịla nʼiyi ahụ si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-azọda unu. 19Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu, maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị, oge niile, mgbe mgbe.” Mgbe ahụ, obi unu ga-aghọta okwu Chineke; ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.