Aịzaya 28:19
Isaiah 28:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu, maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị, oge niile, mgbe mgbe.” Mgbe ahụ, obi unu ga-aghọta okwu Chineke; ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji.
Isaiah 28:19 in English
Isaiah 28:19 · Berean Standard Bible
As often as it passes through, it will carry you away; it will sweep through morning after morning, by day and by night.” The understanding of this message will bring sheer terror.
Context
17Ikpe ziri ezi ga-abụ eriri ọtụtụ nke ji atụ ihe,
ezi omume ga-abụkwa ihe ịtụ mgbidi;
akụmmiri nke oke mmiri ozuzo, ga-ekpochapụ ebe mgbaba unu, okwu ụgha unu,
mmiri ga-etojukwa nʼebe nzuzo unu. 18Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara;
mkpebi unu na ala mmụọ agaghị eguzokwa.
Mgbe oke ịla nʼiyi ahụ si nʼebe unu nọ na-agafe,
ọ ga-azọda unu. 19Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu,
maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị,
oge niile, mgbe mgbe.”
Mgbe ahụ, obi unu ga-aghọta okwu Chineke;
ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji. 20Ihe ndina dị mkpụmkpụ, mmadụ enweghị ike esetipụ onwe ya nʼelu ya;
akwa mkpuchi dị oke warawara, mmadụ enweghị ike iji ya fụchizie ahụ nke ọma. 21Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim,
ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn,
ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa,
na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.