Native Bible

Isaiah 28:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ọ gwara unu okwu sị, “Lee, nke a bụ ebe izuike ahụ, ebe onye ike gwụrụ nwere ike ịnọ zuru ike; nke a bụ ebe ịgbaume ahụ.” Ma ha jụrụ ige ya ntị.

Isaiah 28:12 in English

Isaiah 28:12 · Berean Standard Bible

to whom He has said: “This is the place of rest, let the weary rest; this is the place of repose.” But they would not listen.

Context

10Nʼihi na ọ na-agbalị izi anyị ihe dịka e si dee ya, ahịrị ime nke a, nʼahịrị ime nke ọzọ, nʼusoro tụkwasị nʼusoro, nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ.” 11Nʼezie, Chineke ga-eji ndị na-asụ asụsụ unu na-amaghị zi unu ihe. 12Nʼihi na ọ gwara unu okwu sị, “Lee, nke a bụ ebe izuike ahụ, ebe onye ike gwụrụ nwere ike ịnọ zuru ike; nke a bụ ebe ịgbaume ahụ.” Ma ha jụrụ ige ya ntị. 13Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu Onyenwe anyị nʼahịrị nʼahịrị, nʼusoro nʼusoro; nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ, ka unu gaa sụọ ngọngọ dalaa azụ, ka unu bụrụ ndị e tihịara ahụ, ndị ọnya mara, ndị e jidekwara. 14Nʼihi nke a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-akwa emo, ndị ọchịchị Jerusalem dị nʼaka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.