Native Bible

Isaiah 22:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Elam bu akpa àkụ, ya na ndị nọkwasịrị nʼelu ụgbọala na ịnyịnya ha; Kia ewepụtakwala ọta.

Isaiah 22:6 in English

Isaiah 22:6 · Berean Standard Bible

Elam takes up a quiver, with chariots and horsemen, and Kir uncovers the shield.

Context

4Nʼihi nke a, asịrị m, “Lepụnụ m anya ka m nọọrọ onwe m; ka m bee akwa dị ilu. Unu anwakwala ịkasị m obi, nʼihi mbibi e bibiri ndị m.” 5Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị ụbọchị ọgbaaghara na nzọda na ihe nke ịgba mmadụ gharịị, nʼime ndagwurugwu nke ọhụ, ọ bụ ụbọchị itida mgbidi na nke itiku ugwu niile mkpu akwa. 6Elam bu akpa àkụ, ya na ndị nọkwasịrị nʼelu ụgbọala na ịnyịnya ha; Kia ewepụtakwala ọta. 7Ụgbọala jupụtara na ndagwurugwu unu niile mara mma; ndị na-agba ịnyịnya anọchisiela ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼobodo unu. 8Onyenwe anyị wezugara ihe nchedo niile nke Juda, nʼụbọchị ahụ unu legidere anya na ngwa agha dị nʼỤlọeze dị nʼOke ọhịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.