Aịzaya 22:6
Isaiah 22:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Elam bu akpa àkụ, ya na ndị nọkwasịrị nʼelu ụgbọala na ịnyịnya ha; Kia ewepụtakwala ọta.
Isaiah 22:6 in English
Isaiah 22:6 · Berean Standard Bible
Elam takes up a quiver, with chariots and horsemen, and Kir uncovers the shield.
Context
4Nʼihi nke a, asịrị m, “Lepụnụ m anya ka m nọọrọ onwe m;
ka m bee akwa dị ilu.
Unu anwakwala ịkasị m obi,
nʼihi mbibi e bibiri ndị m.” 5Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị
ụbọchị ọgbaaghara na nzọda na ihe nke ịgba mmadụ gharịị,
nʼime ndagwurugwu nke ọhụ,
ọ bụ ụbọchị itida mgbidi
na nke itiku ugwu niile mkpu akwa. 6Elam bu akpa àkụ,
ya na ndị nọkwasịrị nʼelu ụgbọala na ịnyịnya ha;
Kia ewepụtakwala ọta. 7Ụgbọala jupụtara na ndagwurugwu unu niile mara mma;
ndị na-agba ịnyịnya anọchisiela ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼobodo unu. 8Onyenwe anyị wezugara ihe nchedo niile nke Juda,
nʼụbọchị ahụ unu legidere anya
na ngwa agha dị nʼỤlọeze dị nʼOke ọhịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.