Aịzaya 22:5
Isaiah 22:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị ụbọchị ọgbaaghara na nzọda na ihe nke ịgba mmadụ gharịị, nʼime ndagwurugwu nke ọhụ, ọ bụ ụbọchị itida mgbidi na nke itiku ugwu niile mkpu akwa.
Isaiah 22:5 in English
Isaiah 22:5 · Berean Standard Bible
For the Lord GOD of Hosts has set a day of tumult and trampling and confusion in the Valley of Vision— of breaking down the walls and crying to the mountains.
Context
3Ndịisi unu niile agbapụchaala.*
E jidechara ha niile na-enweghị àkụ ọbụla a gbapụrụ.
Unu niile e jidere ka a dọkpụụrụ nʼotu dịka ndị mkpọrọ
bụ ndị ahụ gbapụrụ ọsọ mgbe ndị iro ka nọrịị ebe dị anya. 4Nʼihi nke a, asịrị m, “Lepụnụ m anya ka m nọọrọ onwe m;
ka m bee akwa dị ilu.
Unu anwakwala ịkasị m obi,
nʼihi mbibi e bibiri ndị m.” 5Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị
ụbọchị ọgbaaghara na nzọda na ihe nke ịgba mmadụ gharịị,
nʼime ndagwurugwu nke ọhụ,
ọ bụ ụbọchị itida mgbidi
na nke itiku ugwu niile mkpu akwa. 6Elam bu akpa àkụ,
ya na ndị nọkwasịrị nʼelu ụgbọala na ịnyịnya ha;
Kia ewepụtakwala ọta. 7Ụgbọala jupụtara na ndagwurugwu unu niile mara mma;
ndị na-agba ịnyịnya anọchisiela ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼobodo unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.