Native Bible

Isaiah 22:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndịisi unu niile agbapụchaala.* E jidechara ha niile na-enweghị àkụ ọbụla a gbapụrụ. Unu niile e jidere ka a dọkpụụrụ nʼotu dịka ndị mkpọrọ bụ ndị ahụ gbapụrụ ọsọ mgbe ndị iro ka nọrịị ebe dị anya.

Isaiah 22:3 in English

Isaiah 22:3 · Berean Standard Bible

All your rulers have fled together, captured without a bow. All your fugitives were captured together, having fled to a distant place.

Context

1Amụma megide ndagwurugwu nke ọhụ. Ọ bụkwa gịnị na-eme unu ugbu a nke mere na unu niile rịgooro nʼelu ụlọ? 2Gị obodo jupụtara nʼoke ọgbaaghara, gị obodo oke ụzụ na-aṅụrị obi ụtọ? Ndị unu niile nwụrụ anwụghị nʼime ọgbọ agha, ma ọ bụkwanụ site na mma agha. 3Ndịisi unu niile agbapụchaala.* E jidechara ha niile na-enweghị àkụ ọbụla a gbapụrụ. Unu niile e jidere ka a dọkpụụrụ nʼotu dịka ndị mkpọrọ bụ ndị ahụ gbapụrụ ọsọ mgbe ndị iro ka nọrịị ebe dị anya. 4Nʼihi nke a, asịrị m, “Lepụnụ m anya ka m nọọrọ onwe m; ka m bee akwa dị ilu. Unu anwakwala ịkasị m obi, nʼihi mbibi e bibiri ndị m.” 5Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị ụbọchị ọgbaaghara na nzọda na ihe nke ịgba mmadụ gharịị, nʼime ndagwurugwu nke ọhụ, ọ bụ ụbọchị itida mgbidi na nke itiku ugwu niile mkpu akwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.