Aịzaya 22:3
Isaiah 22:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndịisi unu niile agbapụchaala.* E jidechara ha niile na-enweghị àkụ ọbụla a gbapụrụ. Unu niile e jidere ka a dọkpụụrụ nʼotu dịka ndị mkpọrọ bụ ndị ahụ gbapụrụ ọsọ mgbe ndị iro ka nọrịị ebe dị anya.
Isaiah 22:3 in English
Isaiah 22:3 · Berean Standard Bible
All your rulers have fled together, captured without a bow. All your fugitives were captured together, having fled to a distant place.
Context
1Amụma megide ndagwurugwu nke ọhụ.
Ọ bụkwa gịnị na-eme unu ugbu a
nke mere na unu niile rịgooro nʼelu ụlọ? 2Gị obodo jupụtara nʼoke ọgbaaghara,
gị obodo oke ụzụ na-aṅụrị obi ụtọ?
Ndị unu niile nwụrụ anwụghị nʼime ọgbọ agha,
ma ọ bụkwanụ site na mma agha. 3Ndịisi unu niile agbapụchaala.*
E jidechara ha niile na-enweghị àkụ ọbụla a gbapụrụ.
Unu niile e jidere ka a dọkpụụrụ nʼotu dịka ndị mkpọrọ
bụ ndị ahụ gbapụrụ ọsọ mgbe ndị iro ka nọrịị ebe dị anya. 4Nʼihi nke a, asịrị m, “Lepụnụ m anya ka m nọọrọ onwe m;
ka m bee akwa dị ilu.
Unu anwakwala ịkasị m obi,
nʼihi mbibi e bibiri ndị m.” 5Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị
ụbọchị ọgbaaghara na nzọda na ihe nke ịgba mmadụ gharịị,
nʼime ndagwurugwu nke ọhụ,
ọ bụ ụbọchị itida mgbidi
na nke itiku ugwu niile mkpu akwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.