Aịzaya 22:2
Isaiah 22:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị obodo jupụtara nʼoke ọgbaaghara, gị obodo oke ụzụ na-aṅụrị obi ụtọ? Ndị unu niile nwụrụ anwụghị nʼime ọgbọ agha, ma ọ bụkwanụ site na mma agha.
Isaiah 22:2 in English
Isaiah 22:2 · Berean Standard Bible
O city of commotion, O town of revelry? Your slain did not die by the sword, nor were they killed in battle.
Context
1Amụma megide ndagwurugwu nke ọhụ.
Ọ bụkwa gịnị na-eme unu ugbu a
nke mere na unu niile rịgooro nʼelu ụlọ? 2Gị obodo jupụtara nʼoke ọgbaaghara,
gị obodo oke ụzụ na-aṅụrị obi ụtọ?
Ndị unu niile nwụrụ anwụghị nʼime ọgbọ agha,
ma ọ bụkwanụ site na mma agha. 3Ndịisi unu niile agbapụchaala.*
E jidechara ha niile na-enweghị àkụ ọbụla a gbapụrụ.
Unu niile e jidere ka a dọkpụụrụ nʼotu dịka ndị mkpọrọ
bụ ndị ahụ gbapụrụ ọsọ mgbe ndị iro ka nọrịị ebe dị anya. 4Nʼihi nke a, asịrị m, “Lepụnụ m anya ka m nọọrọ onwe m;
ka m bee akwa dị ilu.
Unu anwakwala ịkasị m obi,
nʼihi mbibi e bibiri ndị m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.