Aịzaya 22:7
Isaiah 22:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụgbọala jupụtara na ndagwurugwu unu niile mara mma; ndị na-agba ịnyịnya anọchisiela ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼobodo unu.
Isaiah 22:7 in English
Isaiah 22:7 · Berean Standard Bible
Your choicest valleys are full of chariots, and horsemen are posted at the gates.
Context
5Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị
ụbọchị ọgbaaghara na nzọda na ihe nke ịgba mmadụ gharịị,
nʼime ndagwurugwu nke ọhụ,
ọ bụ ụbọchị itida mgbidi
na nke itiku ugwu niile mkpu akwa. 6Elam bu akpa àkụ,
ya na ndị nọkwasịrị nʼelu ụgbọala na ịnyịnya ha;
Kia ewepụtakwala ọta. 7Ụgbọala jupụtara na ndagwurugwu unu niile mara mma;
ndị na-agba ịnyịnya anọchisiela ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼobodo unu. 8Onyenwe anyị wezugara ihe nchedo niile nke Juda,
nʼụbọchị ahụ unu legidere anya
na ngwa agha dị nʼỤlọeze dị nʼOke ọhịa. 9Unu hụrụ na mgbidi obodo Devid
nwere ọtụtụ mgbawa nʼebe dị iche iche na ya.
Unu chekọtara mmiri
nʼọdọ mmiri nke ala ala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.