Aịzaya 2:17
Isaiah 2:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala. Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
Isaiah 2:17 in English
Isaiah 2:17 · Berean Standard Bible
So the pride of man will be brought low, and the loftiness of men will be humbled; the LORD alone will be exalted in that day,
Context
15nye ụlọ elu niile,
na mgbidi niile e wusiri ike, 16nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa,*
na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma. 17Onye nganga ka a ga-eweda nʼala,
mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala.
Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ. 18A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa. 19Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume,
na nʼọnụ e gwuru nʼala,
nʼihi egwu Onyenwe anyị,
na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya,
mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.