Aịzaya 2:18
Isaiah 2:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa.
Isaiah 2:18 in English
Isaiah 2:18 · Berean Standard Bible
and the idols will vanish completely.
Context
16nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa,*
na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma. 17Onye nganga ka a ga-eweda nʼala,
mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala.
Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ. 18A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa. 19Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume,
na nʼọnụ e gwuru nʼala,
nʼihi egwu Onyenwe anyị,
na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya,
mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa. 20Nʼụbọchị ndị ahụ,
ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ,
nke ha kpụrụ ma na-efe,
hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.