Native Bible

Isaiah 2:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa.

Isaiah 2:18 in English

Isaiah 2:18 · Berean Standard Bible

and the idols will vanish completely.

Context

16nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa,* na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma. 17Onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala. Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ. 18A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa. 19Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume, na nʼọnụ e gwuru nʼala, nʼihi egwu Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa. 20Nʼụbọchị ndị ahụ, ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ, nke ha kpụrụ ma na-efe, hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.