Native Bible

Isaiah 2:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụbọchị ndị ahụ, ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ, nke ha kpụrụ ma na-efe, hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ.

Isaiah 2:20 in English

Isaiah 2:20 · Berean Standard Bible

In that day men will cast away to the moles and bats their idols of silver and gold— the idols they made to worship.

Context

18A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa. 19Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume, na nʼọnụ e gwuru nʼala, nʼihi egwu Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa. 20Nʼụbọchị ndị ahụ, ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ, nke ha kpụrụ ma na-efe, hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ. 21Mgbe ahụ, ha ga-ezo onwe ha nʼoghere niile dị nʼoke nkume, na nʼime ọgba niile nke oke nkume nʼihi ịgbanarị iwe ọkụ Onyenwe anyị, na ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe o biliri ịyọgharị ụwa. 22Kwụsị ịtụkwasị mmadụ efu obi. O nweghị ihe ọ bụ karịa naanị nkuume ahụ dị ya nʼime, nʼihi gịnị ka e ji agụnye ya? 2:3 Ya bụ, ụkpụrụ 2:3 Zek 8:21-23 2:3 Luk 24:47 2:13 Lebanọn bụ obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ihe e ji mara obodo a bụ osisi ook na-eto nʼebe ahụ na ehi Zek 11:1-2 2:16 Ụgbọ niile nke Tashish

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.