Aịzaya 2:20
Isaiah 2:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ndị ahụ, ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ, nke ha kpụrụ ma na-efe, hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ.
Isaiah 2:20 in English
Isaiah 2:20 · Berean Standard Bible
In that day men will cast away to the moles and bats their idols of silver and gold— the idols they made to worship.
Context
18A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa. 19Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume,
na nʼọnụ e gwuru nʼala,
nʼihi egwu Onyenwe anyị,
na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya,
mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa. 20Nʼụbọchị ndị ahụ,
ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ,
nke ha kpụrụ ma na-efe,
hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ. 21Mgbe ahụ, ha ga-ezo onwe ha nʼoghere niile dị nʼoke nkume,
na nʼime ọgba niile nke oke nkume
nʼihi ịgbanarị iwe ọkụ Onyenwe anyị,
na ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya,
mgbe o biliri ịyọgharị ụwa. 22Kwụsị ịtụkwasị mmadụ efu obi.
O nweghị ihe ọ bụ karịa naanị nkuume ahụ dị ya nʼime,
nʼihi gịnị ka e ji agụnye ya?
2:3 Ya bụ, ụkpụrụ
2:3 Zek 8:21-23
2:3 Luk 24:47
2:13 Lebanọn bụ obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ihe e ji mara obodo a bụ osisi ook na-eto nʼebe ahụ na ehi Zek 11:1-2
2:16 Ụgbọ niile nke Tashish
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.