Aịzaya 16:7
Isaiah 16:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa, ha na-ebetara Moab akwa. Kwasie akwa ike, nwee mwute, nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset.
Isaiah 16:7 in English
Isaiah 16:7 · Berean Standard Bible
Therefore let Moab wail; let them wail together for Moab. Moan for the raisin cakes of Kir-hareseth, you who are utterly stricken.
Context
5A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya;
otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi,
otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid,
bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi,*
na-emekwa ngwa ime ezi omume. 6Anyị anụla akụkọ banyere Moab,
nụkwa ihe banyere nganga* ya na aghụghọ ya niile.
Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi?
Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ. 7Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa,
ha na-ebetara Moab akwa.
Kwasie akwa ike, nwee mwute,
nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset. 8Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu;
osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala.
E, ndị eze mba dị iche iche azọdala
ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ.
E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza,
ruokwa nʼọzara,
nke mgbọrọgwụ ha gbasara
ruo nʼọnụ osimiri. 9Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza* si akwa akwa
nʼihi ubi vaịnị Sibma.
Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ
gị Heshbọn, na gị Eleale,*
nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada
mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.