Native Bible

Isaiah 16:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza* si akwa akwa nʼihi ubi vaịnị Sibma. Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ gị Heshbọn, na gị Eleale,* nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ.

Isaiah 16:9 in English

Isaiah 16:9 · Berean Standard Bible

So I weep with Jazer for the vines of Sibmah; I drench Heshbon and Elealeh with my tears. Triumphant shouts have fallen silent over your summer fruit and your harvest.

Context

7Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa, ha na-ebetara Moab akwa. Kwasie akwa ike, nwee mwute, nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset. 8Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu; osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala. E, ndị eze mba dị iche iche azọdala ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ. E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza, ruokwa nʼọzara, nke mgbọrọgwụ ha gbasara ruo nʼọnụ osimiri. 9Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza* si akwa akwa nʼihi ubi vaịnị Sibma. Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ gị Heshbọn, na gị Eleale,* nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ. 10Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma, ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige; ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya; nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị. 11Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara, ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.