Aịzaya 16:9
Isaiah 16:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza* si akwa akwa nʼihi ubi vaịnị Sibma. Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ gị Heshbọn, na gị Eleale,* nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ.
Isaiah 16:9 in English
Isaiah 16:9 · Berean Standard Bible
So I weep with Jazer for the vines of Sibmah; I drench Heshbon and Elealeh with my tears. Triumphant shouts have fallen silent over your summer fruit and your harvest.
Context
7Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa,
ha na-ebetara Moab akwa.
Kwasie akwa ike, nwee mwute,
nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset. 8Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu;
osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala.
E, ndị eze mba dị iche iche azọdala
ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ.
E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza,
ruokwa nʼọzara,
nke mgbọrọgwụ ha gbasara
ruo nʼọnụ osimiri. 9Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza* si akwa akwa
nʼihi ubi vaịnị Sibma.
Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ
gị Heshbọn, na gị Eleale,*
nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada
mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ. 10Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma,
ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige;
ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya;
nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị. 11Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara,
ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.