Aịzaya 16:10
Isaiah 16:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma, ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige; ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya; nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị.
Isaiah 16:10 in English
Isaiah 16:10 · Berean Standard Bible
Joy and gladness are removed from the orchard; no one sings or shouts in the vineyards. No one tramples the grapes in the winepresses; I have put an end to the cheering.
Context
8Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu;
osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala.
E, ndị eze mba dị iche iche azọdala
ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ.
E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza,
ruokwa nʼọzara,
nke mgbọrọgwụ ha gbasara
ruo nʼọnụ osimiri. 9Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza* si akwa akwa
nʼihi ubi vaịnị Sibma.
Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ
gị Heshbọn, na gị Eleale,*
nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada
mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ. 10Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma,
ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige;
ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya;
nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị. 11Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara,
ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres. 12Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu,
ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya,
mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya,
o nweghị uru nke a ga-abara ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.