Native Bible

Isaiah 16:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu, ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya, mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya, o nweghị uru nke a ga-abara ha.

Isaiah 16:12 in English

Isaiah 16:12 · Berean Standard Bible

When Moab appears on the high place, when he wearies himself and enters his sanctuary to pray, it will do him no good.

Context

10Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma, ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige; ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya; nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị. 11Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara, ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres. 12Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu, ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya, mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya, o nweghị uru nke a ga-abara ha. 13Ihe ndị a niile bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Moab na mbụ, 14ma ugbu a Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Tupu afọ atọ agachaa, dịka onye e goro ọrụ* si agụ afọ, a ga-eleli ugwu niile Moab nwere, ya na igwe mmadụ ya bara ụba. Ndị fọdụkwara ndụ ga-adị naanị mmadụ ole na ole bụrụkwa ndị na-adịghị ike.” 16:2 Mmiri Anọn nke dị nʼakụkụ ugwu oke ala ahụ, bụ iyi dị mkpa nʼala Moab Ọnụ 21:13-14 16:5 Aịz 9:6-7; Aịz 32:1; Dan 7:14; Luk 1:33; Mkp 11:15 16:6 Jer 48:29; Ọbd 3; Zef 2:8 16:9 Aịz 15:4 16:9 Ọnụ 32:3; Jer 48:34 16:14 Job 7:1; 14:6; Aịz 21:16

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.