Native Bible

Isaiah 16:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ndị a niile bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Moab na mbụ,

Isaiah 16:13 in English

Isaiah 16:13 · Berean Standard Bible

This is the message that the LORD spoke earlier concerning Moab.

Context

11Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara, ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres. 12Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu, ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya, mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya, o nweghị uru nke a ga-abara ha. 13Ihe ndị a niile bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Moab na mbụ, 14ma ugbu a Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Tupu afọ atọ agachaa, dịka onye e goro ọrụ* si agụ afọ, a ga-eleli ugwu niile Moab nwere, ya na igwe mmadụ ya bara ụba. Ndị fọdụkwara ndụ ga-adị naanị mmadụ ole na ole bụrụkwa ndị na-adịghị ike.” 16:2 Mmiri Anọn nke dị nʼakụkụ ugwu oke ala ahụ, bụ iyi dị mkpa nʼala Moab Ọnụ 21:13-14 16:5 Aịz 9:6-7; Aịz 32:1; Dan 7:14; Luk 1:33; Mkp 11:15 16:6 Jer 48:29; Ọbd 3; Zef 2:8 16:9 Aịz 15:4 16:9 Ọnụ 32:3; Jer 48:34 16:14 Job 7:1; 14:6; Aịz 21:16

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.