Aịzaya 16:6
Isaiah 16:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị anụla akụkọ banyere Moab, nụkwa ihe banyere nganga* ya na aghụghọ ya niile. Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi? Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.
Isaiah 16:6 in English
Isaiah 16:6 · Berean Standard Bible
We have heard of Moab’s pomposity, his exceeding pride and conceit, his overflowing arrogance. But his boasting is empty.
Context
4Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu,
ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.”
Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ,
mbibi ga-akwụsịkwa,
onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ. 5A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya;
otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi,
otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid,
bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi,*
na-emekwa ngwa ime ezi omume. 6Anyị anụla akụkọ banyere Moab,
nụkwa ihe banyere nganga* ya na aghụghọ ya niile.
Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi?
Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ. 7Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa,
ha na-ebetara Moab akwa.
Kwasie akwa ike, nwee mwute,
nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset. 8Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu;
osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala.
E, ndị eze mba dị iche iche azọdala
ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ.
E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza,
ruokwa nʼọzara,
nke mgbọrọgwụ ha gbasara
ruo nʼọnụ osimiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.