Native Bible

Isaiah 16:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu, ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.” Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ, mbibi ga-akwụsịkwa, onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ.

Isaiah 16:4 in English

Isaiah 16:4 · Berean Standard Bible

Let my fugitives stay with you; be a refuge for Moab from the destroyer.” When the oppressor has gone, destruction has ceased, and the oppressors have vanished from the land,

Context

2Ndị inyom Moab nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn* na-akwụgharị dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ. 3Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,” “Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri. Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị nʼetiti oke ehihie. Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ, ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe. 4Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu, ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.” Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ, mbibi ga-akwụsịkwa, onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ. 5A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya; otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi, otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid, bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi,* na-emekwa ngwa ime ezi omume. 6Anyị anụla akụkọ banyere Moab, nụkwa ihe banyere nganga* ya na aghụghọ ya niile. Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi? Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.