Aịzaya 16:4
Isaiah 16:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu, ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.” Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ, mbibi ga-akwụsịkwa, onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ.
Isaiah 16:4 in English
Isaiah 16:4 · Berean Standard Bible
Let my fugitives stay with you; be a refuge for Moab from the destroyer.” When the oppressor has gone, destruction has ceased, and the oppressors have vanished from the land,
Context
2Ndị inyom Moab
nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn*
na-akwụgharị
dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ. 3Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,”
“Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri.
Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị
nʼetiti oke ehihie.
Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ,
ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe. 4Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu,
ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.”
Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ,
mbibi ga-akwụsịkwa,
onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ. 5A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya;
otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi,
otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid,
bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi,*
na-emekwa ngwa ime ezi omume. 6Anyị anụla akụkọ banyere Moab,
nụkwa ihe banyere nganga* ya na aghụghọ ya niile.
Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi?
Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.