Aịzaya 16:3
Isaiah 16:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,” “Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri. Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị nʼetiti oke ehihie. Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ, ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe.
Isaiah 16:3 in English
Isaiah 16:3 · Berean Standard Bible
“Give us counsel; render a decision. Shelter us at noonday with shade as dark as night. Hide the refugees; do not betray the one who flees.
Context
1Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye
nye onye na-achị ala ahụ
site na Sela, gafee nʼụzọ ọzara
ruo ugwu nke Ada Zayọn. 2Ndị inyom Moab
nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn*
na-akwụgharị
dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ. 3Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,”
“Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri.
Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị
nʼetiti oke ehihie.
Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ,
ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe. 4Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu,
ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.”
Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ,
mbibi ga-akwụsịkwa,
onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ. 5A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya;
otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi,
otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid,
bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi,*
na-emekwa ngwa ime ezi omume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.