Aịzaya 16:1
Isaiah 16:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye nye onye na-achị ala ahụ site na Sela, gafee nʼụzọ ọzara ruo ugwu nke Ada Zayọn.
Isaiah 16:1 in English
Isaiah 16:1 · Berean Standard Bible
Send the tribute lambs to the ruler of the land, from Sela in the desert to the mount of Daughter Zion.
Context
1Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye
nye onye na-achị ala ahụ
site na Sela, gafee nʼụzọ ọzara
ruo ugwu nke Ada Zayọn. 2Ndị inyom Moab
nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn*
na-akwụgharị
dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ. 3Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,”
“Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri.
Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị
nʼetiti oke ehihie.
Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ,
ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.