Aịzaya 16:2
Isaiah 16:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị inyom Moab nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn* na-akwụgharị dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ.
Isaiah 16:2 in English
Isaiah 16:2 · Berean Standard Bible
Like fluttering birds pushed out of the nest, so are the daughters of Moab at the fords of the Arnon:
Context
1Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye
nye onye na-achị ala ahụ
site na Sela, gafee nʼụzọ ọzara
ruo ugwu nke Ada Zayọn. 2Ndị inyom Moab
nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn*
na-akwụgharị
dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ. 3Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,”
“Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri.
Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị
nʼetiti oke ehihie.
Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ,
ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe. 4Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu,
ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.”
Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ,
mbibi ga-akwụsịkwa,
onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.